BBC News, Ìgbò - Akụkọ
Isi akụkọ
Mwakpo ndị na-eyi ọha egwu adịghịzi ka ọ dị na mbụ na Naịjirịa – Minista nchekwa
Ọtụtụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ minista na-ahụ maka nchekwa na Naịjirịa bụ Christopher Musa kwuru na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ
Igwe mmadụ sị na anyị zuru 'ohi amụ' - ebubo na-agbasa na soshal midịa
Igwe mmadụ egbuola ndị ọnụọgụgụ ha karịrị iri asatọ maka ebubo izu ori akụkụ ahụ mmadụ ji amụ nwa, BBC chọpụtara nke a na ndekọ ha wetere na mba Afrịka isii.
Onye bụ Ifeanyi Onukwubiri nwe ụlọọrụ 'TMT Travel and Tours' ndị uweojii nwụchiri?
Maazị Ifeanyi Onukwubiri bụ onye a na-ebo ebubo na o ji aghụghọ napụ ndị mmadụ karịrị narị abụọ ego sị na ọ ga nyere aka nweta akwụkwọ njem eji aga mba ofesi.
Ọnwụ Tupac Shakur: A maala "Keffe D" Davis, onye bụbu onye ndu ndị otu nzuzo ikpe
N'ime izu ole na ole gara aga, ikpe ahụ a na-ekpe na Las Vegas lekwasịrị anya n'akwụkwọ ncheta (memoir) Davis bipụtara n'afọ 2019, ebe o dere na ọ bụ ya nyere ngwaagha e ji gbuo Tupac.
Kọwaara m isi akụkọ
Vidio, Akụkọ dị mkpa - Septemba 4, 2026, Duration 1,00
Akụkọ ndị kachasị mkpa n'ụwa taa bụ Wenezde Septemba 34 2026.
Onye bụ Stella Okunna, nwanyị mbụ bụ ọkammụta na ngalaba agụmaakwụkwọ mgbasaozi na Naịjirịa?
Ihe ndị i kwesịrị ịma maka Ọkammụta Stella Okunna, nwaanyị mbụ bụ Ọkammụta na ngalaba mgbasaozi na Naịjirịa.
Ndị nwụrụ n'idemmiri Nepal agafeela 1,000 - Ụlọọrụ gbatagbata
Akụkọ kwuru n'ihe karịrị mmadụ 3,900 ka na-efu dịka ndị ọrụ karịrị mmadụ 600 tọrọ n'ime ọwara mmiri apịtị jupụtara na ya.
Ọ bụ ndịagha chọrọ ịkwatu ọchịchị n'ike wakporo Niamey - Gọọmenti Niger
Otu onye bi na Niamey gwara BBC na ha bidoro ịnụ ụda egbe oge ọ kụrụ elekere nke mbụ n'ụtụtụ Satọde.
'Ị malite ịgba ọsọ, ha ga-agba gị egbe': N'ime mwakpo na-akawanye njọ na Naịjirịa
Ọtụtụ obodo nọ n'oke egwu na e nwereike ịtọrọ ha dịka mwakpo a na-akawanye njọ.
Ihe mere Onyeisiala Tinubu ji ọchọghị ka FBI na ndị ọzọ gosi akwụkwọ metụtara ebubo ibu ọgwụike
Ụlọikpe na mba Amerịka na-eleba anya n'akwụkwọ metụtara ebubo sị na Onyeisiala Bola Tinubu tụrụ mgbere ọgwụike n'oge gara aga.
Ụlọikpe mba UK ekwuola na ọgbaegwu Poco Lee ga-apụta zara ọnụ ya maka ụfọdụ ebubo e boro ya
Ụlọikpe kwurụ na Poco Lee ga-apụta zara ọnụ ya n'ụbọchị Tuzde abalị iri na ise n'ọnwa Septemba 2026.
Onye bụ Nwabueze Buchi George ICPC kwuru nọ n'isi ụlọọrụ adịgboroja ọhụrụ ha chọpụtara?
Ụlọọrụ na-ebu agha megide mpụ na Naịjirịa bụ ICPC kwuru na ha nyochapụytara ụlọọrụ adịgboroja ọzọ nakwa nwamadị nọ n'isi ụlọọrụ ahụ.
BBC News Igbo nọ na WhatsApp gị
Nweta akụkọ na mgbasaozi niile ndị ọrụ anyị haziri n'Igbo, ma bụrụkwa onye mbụ ga-anụ akụkọ niile dị mkpa na-akpọtụ na Naịjirịa nakwa n'ụwa niile.
